ABÙ ỌMA 145:10-13
ABÙ ỌMA 145:10-13 IGBOB
Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya; Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.

