Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 145:10-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ ỌMA 145:10-13 IGBOB (Bible Nso)

Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya; Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.

ABÙ ỌMA 145:10-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

O ONYENWE ANYị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.