Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 48

48
1Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n'akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, n'akuku Ugwu n'akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè. 2N'akuku ókè-ala Dan, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Asha, otù òkè. 3N'akuku ókè-ala Asha, site n'akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè. 4N'akuku ókè-ala Naftali, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Manase, otù òkè. 5N'akuku ókè-ala Manase, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Efraim, otù òkè. 6N'akuku ókè-ala Efraim, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Reuben, otù òkè. 7N'akuku ókè-ala Reuben, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku ọdida-anyanwu; Juda, otù òkè.
8Ma n'akuku ókè-ala Juda, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu, ka àjà-nbuli nke unu gēbuli gādi, orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri bu obosara-ya, ogologo-ya gādi kwa ka otù nime òkè ndia, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu: ebe nsọ Chineke gādi kwa n'etiti ya. 9Àjà-nbuli ahu nke unu gēbuliri Jehova, ogologo-ya gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara-ya gādi kwa orú nnù ami na nnù ise. 10Ọ bu kwa ndia, bú ndi-nchu-àjà, gēnwe àjà-nbuli nsọ ahu; n'akuku Ugwu orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, n'akuku Ọdida-anyanwu obosara-ya di orú nnù na nnù ise, n'akuku Iru-anyanwu obosara-ya di orú nnù ise, n'akuku Ndida ogologo-ya di orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri: ebe nsọ nke Jehova gādi kwa n'etiti ya. 11Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru. 12Ọ gābu-kwa-ra ha àjà-nbuli sitere n'àjà-nbuli nke ala nka, ihe di nsọ kachasi ihe nsọ nile, n'ókè-ala ndi Livai. 13Ma n'akuku ókè-ala ndi-nchu-àjà, ka ndi Livai gēnwe orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi orú nnù na nnù ise. Ogologo nile gādi orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara gādi kwa orú nnù na nnù ise. 14Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n'ebe ọzọ: n'ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova. 15Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n'obosara-ya, n'iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n'etiti ya. 16Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n'akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise. 17Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n'akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n'akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri. 18Ma nke fọduru n'ogologo-ya, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n'akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n'akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri. 19Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n'ebo nile nke Israel. 20Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo.
21Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya. 22Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.
23Ma ebo nile nke fọduru: site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè. 24N'akuku ókè-ala Benjamin, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè. 25N'akuku ókè-ala Simeon, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè. 26N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè. 27N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè. 28Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. 29Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
30Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù: 31ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù: 32n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù: 33n'akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù: 34n'akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù. 35Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

EZIKIEL 48: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara