Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi. Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi. Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma, si,
Jekuru ndi nka, si,
N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli;
N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli:
N'ihi na obi ndi nka mara abuba,
Nti-ha kpọchi-kwa-ra,
Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha;
Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya,
Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe,
Ghara kwa iwere obi-ha ghọta,
Ghara kwa ichighari,
Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa. Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha.
O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya