ỌLU NDI-OZI 28:23-30
ỌLU NDI-OZI 28:23-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha. Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha, “ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.” Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ “Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.” Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha. O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya
ỌLU NDI-OZI 28:23-30 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi. Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi. Mb͕e ha nēnweghi otù olu n'etiti onwe-ha, ha we la, mb͕e Pọl kwusiri otù okwu, si, Mọ Nsọ we site n'ọnu Aisaia onye-amuma gwa nna-unu-hà okwu nke-ọma, si, Jekuru ndi nka, si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa. Mgbe o kwusiri okwu ndia, ndi-Ju we pua, rurita uka nke-uku n'etiti onwe-ha. O we nọgide arọ abua dum n'ulo nke aka ya o goro ego, nānara kwa ndi nile bakutere ya