1
Juel 2:12
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
BIU
“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.”
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Juel 2:12
2
Juel 2:28
“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
Nyochaa Juel 2:28
3
Juel 2:13
Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ ONYENWE ANYị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
Nyochaa Juel 2:13
4
Juel 2:32
Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha ONYENWE ANYị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka ONYENWE ANYị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ ONYENWE ANYị na-akpọ.
Nyochaa Juel 2:32
5
Juel 2:31
Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị ONYENWE ANYị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.
Nyochaa Juel 2:31
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị