Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI FILIPAI 3:14

Otu Okwu Ga-agbanwe Ndụ Gị
Ụbọchị Anọ
OTU OKWU ná-enyeré gị aka ime ka ndụ gị dị mfe site n'ilekwasị anya nanị n'OTU OKWU n'ime afọ dum. Ịdị mfe nke ịchọpụtà okwu Chineke nwerè maka gị nà-eme ka ọ bụrụ ihe na-akpalite mgbanwe ndụ. Ngwóngwó na ihe tara akpụ̀ nà-eduba na emeghị ihe ọbụla na ahụ mkpọnwụ, ebe ịdị mfe na nlekwasịgidé anya nà-eduba na ịga nke ọma na idòanya. Ihe òfùfè a nke ụbọchị anọ gà-egosi gị otú ị gà-esi wábànyé ruo n'isi nke ebumnuche gị iji nwetá otu okwu ọhụụ maka afọ.

Afọ Ọhụrụ, Otu Chineke Ahụ
Ụbọchị Anọ
Afọ ọhụrụ abịala, ma búrú ka ibú, ihe mgbaru-ọsọ ọhụrụ na mkpebi ndị anyị chọrọ imezù. Ihe niile agbanweela n'ụwa; otu o sila dị, anyị nwerè Chineke n'adịghị agbanwe-agbanwe pụrụ inye anyị afọ agọziri agọzi. Soro m gụọ ihe ọgụgụ ụbọchị anọ a gá-enyeré anyị aka iji ebumnuche dị nzù malite afọ a.