Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 6:14

Mgbaghara
Ụbọchị Anọ
Mgbaghara. Ka anyị leba anya n’amaokwu ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka mgbaghara dị n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị Ahụ
Ụbọchị asaa
Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.