Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JỌN 10:27

E Nyefewo M Chineke Ihe Niile: Ihe Òfùfè Gasị N'eme Mkpali Ndị Nọ Na Mkpọrọ Derè
Ụbọchị Anọ
Akwụkwọ Nsọ bụ̀ akwụkwọ nke mgbapụta, nnwere onwe, na olileanya. N'ime ibe Ya gasị, enwerè ọtụtụ ndị dị iche iche ná akparamá-àgwà ha na obibi ndụ ha ma wee jupụta n'ike— ndị ikom na ndị inyom ndụ tijisìrì ná-achọ́ azịza banyere ngabiga ha na ahụmahụ ha n'ụwa. Ị lee anya, ha dị nnọọ ka ndị nọ na mkpọrọ ugbu a na ndị si na mkpọrọ pụta bụ́ ndị dere ihe òfùfè ndị a i gajè ịgụ. Ọ bụ olileanya anyị na ịga enweta agbamume ma nwee mkpali dị ike na mma site n'olu gasị ndị ụka nọ na mkpọrọ. Ka akaebe ha na nkwupụta ha mee ka anyị niile nwere onwe anyị.

Uwe Ngwa Agha Nke Chineke
Ụbọchị Ise
Kwa ụbọchị, agha ana adịghị ahụ anya nà-ada gburugburu gị— nke ana-ahụghị, nke ana-anụbeghị, ma nwee mmetụta ná ndụ gị nile. Onye iro raará onwe ya nye, nke ekwensu, nà-achọ ibibi ihe niile dị gị mkpa: obi gị, uche gị, alụmdi na nwunye gị, ụmụ gị, nrọ gị, akara aka gị. Atụmatụ agha ya daberè na ijidè gị mgbe iná amaghị ama na mgbe iná enweghị ngwa agha. Ọ bụrụ na ike nkwagharị ma njide n'ádighí njikere agwụla gi, ọmụmụ ihe a bụ maka gị.

Ịnọdụ̀ Jụụ N'oké Nkịtị: Ụbọchị Asaa Nke Ịnọ N'eme Nchere N'ime Nkwa Chineke
Ụbọchị Asaa
Enwerè oge anyị n'anata nkwa n'aka Chineke, mana anyị anaghị ahụ ndụ anyị ka ọ dabarà na nkwa ahụ Chineke kwerè anyị. Ma ọ bụ̀ na e nwerè oge anyị na-eru n'okporo ụzọ chéré ihu n'ọtụtụ ebe na ndụ anyị, anyị a n'eche ka Chineke kwubie okwu ntụzịaka n'ime ndụ anyị, mana nke ahụ emeghị. Ihe òfùfè a nke ụbọchị asaa gà-agwa obi gị okwu gbasara otù ị gà-esi n'eme ihe n'uche Chineke mgbe ọ dị ka Chineke Ọ gbachirì nkịtị.