Romans 8:5-10

N'ihi na ndi di ka anu-aru si chọ nātukwasi uche n'ihe nke anu-aru; ma ndi di ka Mọ Nsọ si chọ nātukwasi uche n'ihe nke Mọ Nsọ. N'ihi na itukwasi uche n'anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo: n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya: ndi nke nọ n'anu-aru apughi kwa itọ Chineke utọ. Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya. Ma ọ buru na Kraist nọ nime unu, aru-unu bu ihe nwuru anwu n'ihi nmehie n'ezie; ma Mọ Nsọ bu ndu n'ihi ezi omume.
NDI ROM 8:5-10