NDI ROM 10:13-17

n'ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya. Hà gēsi kwa aṅa kpọku Onye ahu ha akēkweghi na Ya? ma hà gēsi aṅa kwere n'Onye ahu ha akānughi okwu-Ya? ma hà gēsi aṅa nu ma onye nēkwusa anọghi? ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe! Ma ọ bughi ha nile ṅara ozi ọma ahu nti. N'ihi na Aisaia nāsi, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.
NDI ROM 10:13-17