Revelation 21:3-5

M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha: Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo. Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.
NKPUGHE 21:3-5