Psalms 9:1-10

M'gēji obim nile kele Jehova; M'gākọ kwa akukọ oké ọlu-Gi nile. M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi: M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu; Mb͕e ndi-irom laghachiri azu, Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì. N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem; I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume. I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi. Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi; Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo, Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì. Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi: O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe. Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume, Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi. Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà; Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.
ABÙ ỌMA 9:1-10