ABÙ ỌMA 84:5-12

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi; Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi. Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche; Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya. Ha nēsi n'ike jerue ike, Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem: Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah Le ọta-ayi, Chineke, Legide kwa iru onye-Gi etere manu. N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu. N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.
ABÙ ỌMA 84:5-12