Psalms 8:1-9

Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé. I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya? I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke, I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze. I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua: Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia; Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile. Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!
ABÙ ỌMA 8:1-9