Psalm 68:19-31

Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu, Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa; Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua. Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya, Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya. Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata, M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata: Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara, Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya. Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke, Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya. Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti. Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke, Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel. N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha, Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha, Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali. Chineke-gi enyewo ike-gi iwu: Di ike, Chineke, Gi Onye luworo ayi ọlu. N'ihi ulo uku Gi nime Jerusalem Ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú. Basiere anu-ọhia nke amì nba ike, Ìgwè oke-ehi, ha na umu-ehi nke ndi nile di iche iche, Onye ọ bula nime ha nēkwe ka azọtọ ya n'ukwu nēweta iberibe ọla-ọcha; Ọ chusawo ndi nile di iche iche ndi ilu-ọ̀gù nātọ utọ. Ndi amara aha-ha gēsi n'Ijipt puta; Etiopia gēsetiri Chineke aka-ya abua ngwa ngwa.
ABÙ ỌMA 68:19-31