Psalm 54:1-7

Chineke, were aha-Gi zọputam, Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe. Chineke, nuru ekperem; Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum. N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem, Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim: Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah Le, Chineke bu onye nēyerem aka: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim. Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha: Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha. M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà: M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma. N'ihi na ọ bu na nkpab͕u nile ka Ọ naputaworom; Anyam elekwasiwo kwa ndi-irom.
ABÙ ỌMA 54:1-7