Psalms 51:1-5

Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.
ABÙ ỌMA 51:1-5