Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Psalm 51:1-19

ABÙ ỌMA 51:1-19 - Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di:
Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.
Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem,
Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.
N'ihi na mu onwem mara njehiem nile:
Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile.
Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo,
Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo:
Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu,
Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.
Le, n'ajọ omume ka amuputaram;
Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.
Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ:
Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe.
I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha:
I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.
I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù;
Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.
Zopu iru-Gi na nmehiem nile,
Hichapu kwa ajọ omumem nile.
Kèrem obi di ọcha, Chineke;
Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.
Atupulam n'iru Gi;
Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.
Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi:
Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.
M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile;
Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.
Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam;
Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.
Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua;
Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.
N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya:
Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ.
Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa:
Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya.

Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ:
I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem.
Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ:
Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem. Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ: Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe. I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow. I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù; Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù. Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile. Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem. Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi. Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem. M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile; Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi. Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam; Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi. Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi. N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya: Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ. Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya. Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ: I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem. Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ: Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.

ABÙ ỌMA 51:1-19