Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Psalm 37:3-19

ABÙ ỌMA 37:3-19 - Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;
Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.
Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;
Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.
Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;
Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.
Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,
Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.
Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:
Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,
N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.
Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:
Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.
N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:
Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.
Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:
I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.
Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;
Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,
Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.
Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:
N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia
Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;
Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,
Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:
Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,
Agāb͕aji kwa uta-ha.
Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma
Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.
N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:
Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.
Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:
Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.
Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:
Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya; Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da, Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha: Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha, Agāb͕aji kwa uta-ha. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nma Kari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu: Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè: Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ: Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

ABÙ ỌMA 37:3-19