Psalm 37:3-11

Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru; Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè, Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma: Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
ABÙ ỌMA 37:3-11