M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya:
M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.
Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:
Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,
Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.