Psalms 27:7-14

Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù: Me-kwa-ram amara, zakwam. Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ. Ezonarilam iru-Gi; Ejila iwe wezuga orù-Gi: Iye-akam ka I buworo; Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam. N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam. Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu. Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um: N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume. M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma Jehova N'ala ndi di ndu? Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.
ABÙ ỌMA 27:7-14