Psalm 27:1-4

Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu? Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum, Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala. Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem, Obim agaghi-atu egwu: Ọ buru na agha ebilie imegidem, Na nka ka mu onwem nātukwasi obi. Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.
ABÙ ỌMA 27:1-4