Psalms 23:1-4

Jehova bu onye nāzùm dika aturu; ó dighi ihe kọrọm. N'ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka O nēme ka m'makpu: N'akuku miri nke izu-ike ka Ọ nedum nwayo. Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n'uzọ nile nke ezi omume n'ihi aha-Ya. Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.
ABÙ ỌMA 23:1-4