Psalm 19:7-11

Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe. Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè. Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù. Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi. Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.
ABÙ ỌMA 19:7-11