Psalm 19:1-4

Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi. Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba, Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma. Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di; Anughi olu-ha. N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.
ABÙ ỌMA 19:1-4