Psalms 126:1-6

Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ. Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku. Jehova emeworo ayi ihe uku; Ayi nāṅuri ọṅu. Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata, Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb. Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi. Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.
ABÙ ỌMA 126:1-6