Psalms 121:1-8

M'gēweli anyam abua le ugwu nile: Òle ebe iye-akam gēsi bia? Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia, Onye meworo elu-igwe na uwa. Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura. Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel. Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi. Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali. Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi. Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi, Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
ABÙ ỌMA 121:1-8