Psalm 116:1-8

Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānu Olum, bú aririọ-amaram nile. N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ, Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram: Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu. M'we kpọkue aha Jehova; Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya. Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu; E, Chineke-ayi nwere obi-ebere. Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu: Enweghm ike, O we nyem nzọputa. Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi; N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu, I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri, I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.
ABÙ ỌMA 116:1-8