Psalms 104:24-34

Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova! N'amam-ihe ka I meworo ha nile: Uwa juputara n'ihe I nwetara. Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua, Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu, Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku. N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya. Ha nile nēle anya Gi, Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. I nēnye ha, ha achikọta ya; I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha. I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha. I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu. Ka ebube Jehova dirue mb͕e ebighi-ebi; Ka Jehova ṅuria n'ọlu-Ya nile: Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji; Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku. M'gābùku Jehova abù n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu. Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.
ABÙ ỌMA 104:24-34