Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Psalms 103:1-22

ABÙ ỌMA 103:1-22 - Gọzie Jehova, nkpuru-obim;
Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya.
Gọzie Jehova, nkpuru-obim,
Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:
Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile;
Onye nāgwọ ọria-gi nile;
Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi;
Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche:
Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi;
Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.
Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u
Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe.
Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile,
Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile.
Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara,
Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere.
Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu;
Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.
Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi,
Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi.
N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa,
Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya.
Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu,
Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.
Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya,
Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.
N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi;
Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu.
Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di;
Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko.
N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi;
Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.
Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya,
Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu;
Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya,
Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha.
Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe;
Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile.
Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya,
Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya,
N'ige nti olu nke okwu-Ya.
Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile;
Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ.
Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile,
N'ebe nile Ọ nāchi:
Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi: Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo. Jehova nēmere ndi nile anēmeb͕u Ezi omume nile na ihe nile O kpere n'ikpe. Ọ nēme ka Moses mara uzọ-Ya nile, Ọ nēme kwa ka umu Israel mara omume-Ya nile. Jehova nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n'ebere. Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe. Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ. Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya. N'ihi na Ya onwe-ya mara otú akpuworo ayi; Ọ nēcheta na ájá ka ayi bu. Ma madu, dika ahihia ka ubọchi-ya nile di; Dika okoko-osisi ọhia, otú a ka ọ nāwa okoko. N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ. Ma ebere nke Jehova nēsi na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi n'aru ndi nātu egwu Ya, Ezi omume-Ya di-kwa-ra umu umu; Ọ diri ndi nēdebe ọb͕ub͕a-ndu-Ya, Di-kwa-ra ndi nēcheta ukpuru-Ya ime ha. Jehova emewo ka oche-eze-Ya guzosie ike n'elu-igwe; Ala-eze-Ya nāchi kwa ihe nile. Gọzienu Jehova, ndi-mọ-ozi-Ya, Unu ndi-dike di ike, ndi nēme okwu-Ya, N'ige nti olu nke okwu-Ya. Gọzienu Jehova, usu-ndi-agha-Ya nile; Unu ndi nējere Ya ozi, ndi nēme ihe nātọ Ya utọ. Gọzienu Jehova, unu ọlu-Ya nile, N'ebe nile Ọ nāchi: Gọzie Jehova, nkpuru-obim.

ABÙ ỌMA 103:1-22