Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Sananlaskut 4:6-24

ILU 4:6-24 - Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi;
Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.
Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe:
E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.
Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi:
Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi.
Ọ gēnye isi-gi okpu amara:
Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka.

Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile;
Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba.
N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe;
Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi.
Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi;
Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.
Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka:
Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.
Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu,
Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.
Zere ya, agabigala nime ya;
Wezugara ya onwe-gi, gabiga.
N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;
Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.
N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,
Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.
Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,
Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.
Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:
Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.

Nwam, ṅa nti n'okwum nile;
Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.
Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;
Debe ha n'etiti obi-gi.
N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha,
Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.
Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi;
N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.
Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ,
Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.

Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi: Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi. Ọ gēnye isi-gi okpu amara: Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka. Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile; Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba. N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe; Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi. Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ. Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka: Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi. Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ. Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ. N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu. Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara. Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ. Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile. Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi. N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile. Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.

ILU 4:6-24