Proverbs 23:22-25

Ge nna-gi, bú onye muru gi, nti, Eleda-kwa-la nne-gi anya mb͕e o mere agadi. Zuta ezi-okwu, ere-kwa-la ya; E, amam-ihe, na idọ-aka-na-nti, na nghọta. Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya. Ka nna-gi na nne-gi ṅuria, Ka nwanyi muworo gi teghari kwa egwú ọṅù.
ILU 23:22-25