Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Proverbs 12:1-28

ILU 12:1-28 - Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:
Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:
Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:
Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.
Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:
Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.
Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:
Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.
Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:
Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.
Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:
Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.
Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:
Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda.
Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,
Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.
Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya:
Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.
Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:
Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.
Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:
Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.
Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:
Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta.
Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe:
Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.
Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya:
Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.
Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:
Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.
Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,
Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.
O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:
Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.
Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:
Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.
Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ:
Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.
Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume:
Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ.
Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu:
Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.
Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma:
Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.
Aka ndi di nkọ gāchi achi:
Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè.
Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala;
Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.
Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ:
Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.
Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá:
Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.
N'uzọ ezi omume ka ndu di;
Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya: Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia. Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ: Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe. Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya. Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya: Ma ọ di ka ire-ure n'ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere. Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé: Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ. Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara: Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha. Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa: Ma ulo ndi ezi omume gēguzo. Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi gāghọ onye anēleda. Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù, Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya. Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri: Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya. Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike: Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru. Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di: Ma onye ezi omume gēsi n'ahuhu puta. Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n'ezi ihe: Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya. Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ziri ezi n'anya ya onwe-ya: Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu. Onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya, n'otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya: Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu. Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume, Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ. O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha: Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu. Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi: Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di. Aghughọ di n'obi ndi nēchèputa ihe ọjọ: Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù. Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume: Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n'ihe ọjọ. Ihe-árú n'anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu: Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ. Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ. Aka ndi di nkọ gāchi achi: Ma onye-ume-ngwu gādi n'usu ndi nēfè òfùfè. Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria. Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ: Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue. Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá: Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ. N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.

ILU 12:1-28