Proverbs 11:1-31

Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ. Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di. Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha. Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu. Ezi omume nke onye zuru okè gēme ka uzọ-ya zie ezi: Ma nmebi-iwu nke aka ya ka onye nēmebi iwu gēji da. Ezi omume nke ndi ziri ezi gānaputa ha: Ma n'ọchichọ nke ha nāchọsi ike ka agānwude ndi nāghọb͕u aghọb͕u. Mb͕e madu nke nēmebi iwu nwuru, olile-anya-ya gāla n'iyì: Ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n'iyì. Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya. Ọnu-ya ka onye emeruru emeru ji ebibi madu-ibe-ya: Ma ihe-ọmuma ka agēji dọputa ndi ezi omume. N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ: Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di. Eji ngọzi nke ndi ziri ezi bulie obodo: Ma eji ọnu ndi nēmebi iwu akwada ya. Onye nēleda madu-ibe-ya anya, obi amam-ihe kọrọ ya: Ma onye-nghọta nāb͕a nkiti. Onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ nēkpughe ìzù nzuzo: Ma onye mọ-ya kwesiri ntukwasi-obi nēkpuchi okwu. Mb͕e ọ nādighi ezi ndum-ọdu ọ bula di, ndi ahu gāda: Ma nzọputa di n'ọtutu ndi nādu ọdu. Aghaghi imejọ madu, mb͕e ọ nọworo onye ala ọzọ na mbe: Ma onye nākpọ ndi nānara madu n'aka ibu ndi-mbe asì, ọ nọ na ntukwasi-obi. Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike. Onye nēmeso nkpuru-obi-ya ezi ihe ka onye-ebere bu: Ma onye nēmekpa anu-aru nke aka ya aru ka onye nēnweghi obi-ebere bu. Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi. Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu: Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya. Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu: Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu. Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha. Dika nb͕a-aka ọla-edo n'imi ezì, Otú a ka nwanyi mara nma nke nēsi n'ezi uche wezuga onwe-ya di. Ihe ndi ezi omume nāchọsi ike bu nání ezi ihe: Ma olile-anya nke ndi nēmebi iwu bu nrubiga-ókè nke iwe. O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú. Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe. Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu. Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?
ILU 11:1-31