Philippians 3:10-14

ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m'gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite. Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya. Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m'nēme, ebe m'nēchezọ ihe nile di n'azu, nēsetipu kwa aka n'ebe ihe nile di n'iru di, anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m'we nata ihe anāb͕ata n'ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus.
NDI FILIPAI 3:10-14