Marcos 1:1-8

Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. Dika edeworo ya n'akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n'iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie; Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua. Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.
MAK 1:1-8