Het evangelie naar Matteüs 7:1-6

Unu ekpela ikpé, ka aghara ikpe unu ikpé. N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu. Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? Ma-ọbu ì gēsi aṅa si nwa-nna-gi, Kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu n'anya-gi: ma le, ntuhie ahu di n'anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi; mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu n'anya nwa-nna-gi. Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.
MATIU 7:1-6