Matthew 6:9-15

Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ. Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.
MATIU 6:9-15