Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Matthew 6:7-21

MATIU 6:7-21 - Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu. Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya. Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ. Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi; ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.
Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori: kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori: n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.

Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu. Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya. Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ. Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi; ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi. Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori: kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori: n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.

MATIU 6:7-21