Matthew 6:2-4

Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme: ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.
MATIU 6:2-4