Matthew 5:3-6

Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.
MATIU 5:3-6