Matthew 21:42-44

Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi? N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya. Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá.
MATIU 21:42-44