Luke 24:6-11

Ọ nọghi n'ebe a, kama emere ka O si n'ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili, si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. Ha we cheta okwu-Ya, we si n'ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile. Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia. Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha.
LUK 24:6-11