Luke 19:37-48

Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi; si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu. Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba. O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu. Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá, si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi. N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile, tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi. O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre, nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì: ha ahughi kwa ihe ha gēme; n'ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.
LUK 19:37-48