Lamentations 3:22-33

O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata. Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya. Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi. Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ. N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.
ABÙ-ÁKWÁ 3:22-33