Lamentations 3:21-26

Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
ABÙ-ÁKWÁ 3:21-26