John 14:1-4
Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe. Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.
JỌN 14:1-4