John 1:1-5

Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. Onye ahu na Chineke diri na mbu. Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya. Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu. Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.
JỌN 1:1-5